Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 10:18-29 Bible Nso (IGBOB)

18. Eze me-kwa-ra oké oche-eze ọdu, machita ya ọla-edo anuchara anucha.

19. Oche-eze ahu nwere ihe-nrigo isi, oche-eze ahu nwe-kwa-ra elu di buruburu n'azu ya: aka di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ n'ebe ọnọdu-ya, ọdum abua nēguzo kwa n'akuku aka ahu.

20. Ọdum iri na abua we nēguzo n'ebe ahu n'elu ihe-nrigo isi ahu n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ: emeghi ya otú a nye ala-eze ọ bula.

21. Ihe nile Solomon nwere, bú nke eji aṅu ihe, bu ọla-edo, ihe nile nke ulo oké ọhia Lebanon bu kwa ọla-edo makarisiri nma: ọ dighi nke bu ọla-ọcha; agughi ya n'ihe ọ bula n'ubọchi Solomon.

22. N'ihi na eze nwere ub͕ọ Tashish n'oké osimiri tiyere ub͕ọ Hairam: otù ub͕ò n'arọ atọ ka ub͕ọ Tashish nābia, nēbute ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọdu, na enwe, na ekwuru-ulo.

23. Eze, bú Solomon, we di uku kari eze nile nke uwa n'àkù na n'amam-ihe.

24. Uwa nile we nāchọ iru Solomon, inu amam-ihe-ya, nke Chineke tiyere n'obi-ya.

25. Ndi ahu nēbute kwa, nwoke ọ bula onyinye-inata-iru-ọma-ya, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, na ihe-ekike-agha, na uda di iche iche, na inyinya, na inyinya mule, ihe anēnye n'arọ n'arọ-ya.

26. Solomon we chikọta ub͕ọ-ala na ndi-inyinya: o we nwe nnù ub͕ọ-ala atọ na ọgu iri, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, ọ we do ha n'obodo ub͕ọ-ala, na n'ebe eze nọ na Jerusalem.

27. Eze we me ọla-ọcha ka ọ di ka nkume na Jerusalem, ọ me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n'ebe di ala n'uba.

28. Anēme kwa ka inyinya Solomon nwere si n'Ijipt puta; n'usu ka ndi-ahia eze nānara ha, otù usu n'ọnu-ahia-ya.

29. Otù ub͕ọ-ala we rigota si n'Ijipt puta na nnù shekel ọla-ọcha na ọgu iri, na otù inyinya n'ọgu shekel asa na iri: otú a ka ha nēweputara eze nile nke ndi Het, nēweputa-kwa-ra ndi-eze Siria, site n'aka-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 10