Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 10:11-17 Bible Nso (IGBOB)

11. Ọzọ kwa, ub͕ọ Hairam, nke siri n'Ofia bute ọla-edo, ha siri n'Ofia bubata osisi almug bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia.

12. Eze we were osisi almug ahu mere ulo Jehova, me-kwa-ra ulo eze, ihe-ndabere, ọ were kwa ha mere ndi nābù abù ubọ-akwara na une: osisi almug di otú a abiaghi, ahughi kwa ha, rue ta.

13. Eze, bú Solomon, nye-kwa-ra eze-nwayi Sheba ihe nile nātọ ya utọ, ihe ọ bula ọ riọrọ, nāgughi ihe o nyere ya dika aka eze, bú Solomon, si di. O we chigharia la n'ala-ya, ya onwe-ya na ndi-orù-ya.

14. Ma ọtùtù ọla-edo nke biakutere Solomon n'otù arọ di nnù talent ọla-edo na ọgu iri-na-atọ na isi,

15. nāgughi ihe ndikom ndi nējeghari izu ahia wetara, na ọzuzu-ahia nke ndi nāzu ahia, na ọla-edo nke eze nile nke ndi gwara ọgwa, na ọla-edo nke ndi nāchi ala.

16. Eze, bú Solomon, we me ọgu ọta uku iri, ha bu ọla-edo etisara etisa: nnù shekel ọla-edo na ọgu iri bara n'otù ọta uku.

17. O me-kwa-ra ọgu ọta iri-na-ise, ha bu ọla-edo etisara etisa; pound ọla-edo atọ bara n'otù ọta: eze we tiye ha n'ulo oké ọhia Lebanon.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 10