Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 1:2-18 Bible Nso (IGBOB)

2. Ndi-orù-ya we si ya, Ka ha chọrọ onye-nwem, bú eze, nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ka o guzo kwa n'iru eze, nēkposo kwa ya aru ọku; ka o dina kwa n'obi-gi, ka aru onye-nwem, bú eze, we kpo ọku.

3. Ha we chọ nwa-ab͕ọghọ mara nma n'ókè-ala nile nke Israel, we chọta Abishag onye Shunem, me ka ọ biakute eze.

4. Nwa-ab͕ọghọ ahu mara nma nke-uku; o we nēkposo eze aru ọku, je-kwa-ra ya ozi; ma eze amaghi aru-ya.

5. Ma Adonaija nwa Hagit nēweli onwe-ya elu, si, Mu onwem gābu eze: o we doziere onwe-ya ub͕ọ-ala, na ndi-inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya.

6. Ma ọ dighi mb͕e nna-ya mere ihe nēwuta ya n'ubọchi ndu-ya nile, si, Gini mere i meworo otú a? ọzọ kwa, onye ahu bu onye di nma n'aru nke-ukwu; nne-ya mu-kwa-ra ya mb͕e amusiri Absalom.

7. Okwu-ya we di n'ebe Joab nwa Zeruaia nọ, na n'ebe Abaiata onye-nchu-àjà nọ: ha we so Adonaija nēyere ya aka.

8. Ma Zedok, bú onye-nchu àjà, na Benaia nwa Jehoiada, na Netan, bú onye-amuma, na Shimai, na Rei, na ndi-dike ndi Devid nwere, esoghi kwa Adonaija.

9. Adonaija we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi na anu mara abuba chua àjà n'akuku nkume Zohelet, nke di n'akuku En-rogel; o we kpọ umu-nne-ya nile, bú umu-ndikom eze, na ndikom nile nke Juda, bú ndi-orù eze;

10. ma ọ kpọghi Netan, bú onye-amuma, na Benaia, na ndi-dike ahu, na Solomon, bú nwa-nne-ya.

11. Netan we gwa Bat-sheba, bú nne Solomon, okwu, si, Ì nughi na Adonaija nwa Hagit aghọwo eze, ma Devid, bú onye-nwe-ayi, amaghi?

12. Ma ub͕u a, biko, bia, ka m'dua gi ọdu, ka i we wepuga ndu-gi na ndu nwa-gi, bú Solomon.

13. Je bakwuru eze, bú Devid, si ya, Onye-nwem, bú eze, ọ̀ bughi gi onwe-gi ṅuru orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem? ọ̀ bu kwa gini mere Adonaija ghọworo eze?

14. Le, mb͕e i nọ nākpayere eze uka n'ebe ahu, mu onwem gēso kwa gi n'azu bata, kwujue okwu-gi nile.

15. Bat-sheba we bakuru eze rue ime-ulo: ma eze aghọwo agadi nke-uku: Abishag, bú nwayi Shunem, nēje-kwa-ra eze ozi.

16. Bat-sheba we rube isi, kpọ isi ala nye eze. Eze we si, Gini ka i nāchọ?

17. Ọ si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi were Jehova, bú Chineke-gi, ṅuara orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem.

18. Ma ub͕u a, le, Adonaija aghọwo eze; ma ub͕u a, onye-nwem, bú eze, i maghi ya:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 1