Ma Adonaija nwa Hagit nēweli onwe-ya elu, si, Mu onwem gābu eze: o we doziere onwe-ya ub͕ọ-ala, na ndi-inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya.