Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 9:15-22 Bible Nso (IGBOB)

15. na Bakbaka, na Heresh, na Galal, na Matanaia nwa Maika, nwa Zikri, nwa Esaf;

16. na Obadaia nwa Shemaia, nwa Galal, nwa Jedutun, na Berekaia nwa Esa, nwa Elkena, onye bi n'obodo ntà ndi Netofa.

17. Ndi-ọnu-uzọ-ama kwa; Shalum, na Akub, na Talmon, na Ahaiman, na umu-nne-ha: Shalum bu onye-isi;

18. ma ha nọ rue ub͕u a n'ọnu-uzọ-ama eze n'akuku ọwuwa-anyanwu: ndi ahu bu ndi-ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū umu Livai nwere.

19. Ma Shalum nwa Kora, nwa Ebiasaf, nwa Kora, na umu-nne-ya, nke ulo nna-ya, bú ndi Kora, bu ndi-isi ije-ozi òfùfè ahu, ndi-nche nbata-uzọ nile nke ulo-ikwū: ndi bu nna-ha buri ndi-isi ọmuma-ulo-ikwū Jehova, ndi-nche uzọ-nbata;

20. Finehas nwa Eleeza bu kwa onye-ndú-ha na mb͕e gara aga, Jehova nọyere ya.

21. Zekaraia nwa Meshelemaia bu onye-ọnu-uzọ-ama nke ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

22. Ndia nile arọputara ibu ndi-ọnu-uzọ-ama nime nbata-uzọ nile di ọgu iri na iri na abua. Edere ndi ahu n'akwukwọ-osuso-ọmumu-ha n'obodo ntà ha, ndi ahu ka Devid na Samuel onye-ọhu-uzọ doro n'ọnọdu-ha, bú ọnọdu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 9