Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 8:6-13 Bible Nso (IGBOB)

6. Ndia bu kwa umu-ndikom Ihud: ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi na Geba, ha we me ka ha je biri na Manahat:

7. na Neaman, na Ahaija, na Gira, onye ahu mere ka ha je biri n'ala ọzọ; ọ mua Uza na Ahaihud.

8. Shaharaim we mua umu n'ọhia Moab, mb͕e o zilagasiri ha; Hushim na Baara bu ndinyom-ya.

9. O we site na Hodesh, bú nwunye-ya, mua Jobab, na Zibia, na Misha, na Malkam;

10. na Jeuz, na Shakia, na Miama. Ndia bu umu-ya ndikom, ha bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna.

11. O site-kwa-ra na Hushim mua Abaitub na Elpaal.

12. Umu-ndikom Elpaal; Iba, na Misham, na Shemed; onye ahu wuru Ono na Lod, na umu-obodo-ya:

13. na Beria, na Shema; ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi n'Ajalon, ha onwe-ha mere ka ndi bi na Gat b͕alaga;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 8