Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 8:36-40 Bible Nso (IGBOB)

36. Ehaz we mua Jehoada; Jehoada we mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza:

37. Moza mua Binea; Rafa bu nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya:

38. Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan. Ndia nile bu umu-ndikom Azel.

39. Umu-ndikom Ishek nwa-nne-ya nwoke kwa; Ulam, bú ọkpara-ya, na Jeush, bú nke-abua, na Elifelet, bú nke-atọ.

40. Umu Ulam we buru ndi-dike bu dìnkpà, ndi-ọb͕a-uta, ha nwe-kwa-ra ọtutu umu-ndikom, na umu umu, ọgu asa na iri. Ndia nile sitere n'umu Benjamin.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 8