Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 8:33-40 Bible Nso (IGBOB)

33. Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal.

34. Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika.

35. Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tarea, na Ehaz.

36. Ehaz we mua Jehoada; Jehoada we mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza:

37. Moza mua Binea; Rafa bu nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya:

38. Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan. Ndia nile bu umu-ndikom Azel.

39. Umu-ndikom Ishek nwa-nne-ya nwoke kwa; Ulam, bú ọkpara-ya, na Jeush, bú nke-abua, na Elifelet, bú nke-atọ.

40. Umu Ulam we buru ndi-dike bu dìnkpà, ndi-ọb͕a-uta, ha nwe-kwa-ra ọtutu umu-ndikom, na umu umu, ọgu asa na iri. Ndia nile sitere n'umu Benjamin.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 8