Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 6:38-56 Bible Nso (IGBOB)

38. nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livai, nwa Israel.

39. Na nwa-nne-ya nwoke, bú Esaf, onye nēguzo n'aka-nri-ya, bú Esaf nwa Berekaia, nwa Shimea;

40. nwa Maikael, nwa Baaseia, nwa Malkija;

41. nwa Etni, nwa Zera, nwa Adaia;

42. nwa Itan, nwa Zima, nwa Shimai;

43. nwa Jahat, nwa Giashom, nwa Livai.

44. Umu-ndikom Merari, bú umu-nne-ha, nọ kwa n'aka-ekpe: Itan nwa Kishi, nwa Abdi, nwa Maluk;

45. nwa Hashabaia, nwa Amazaia, nwa Hilkaia;

46. nwa Amzi, nwa Bani, nwa Shemea;

47. nwa Mahli, nwa Mushi, nwa Merari, nwa Livai.

48. Enye-kwa-ra umu-nne-ha, bú ndi Livai, ifè òfùfè nile nke ebe-obibi ulo Chineke.

49. Ma Eron na umu-ya ndikom nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na n'elu ebe-ichu-aja nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bayere ije-ozi nile nke ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ikpuchiri Israel nmehie-ha, dika ihe nile si di nke Moses, bú orù Chineke, nyere n'iwu.

50. Ndia bu kwa umu-ndikom Eron; Eleeza nwa-ya, Finehas nwa-ya, Abishua nwa-ya;

51. Buki nwa-ya, Uzi nwa-ya, Zerahaia nwa-ya;

52. Meraiot nwa-ya, Amaraia nwa-ya, Ahaitub nwa-ya;

53. Zedok nwa-ya, Ahimaaz nwa-ya.

54. Ma ndia bu ebe-obibi-ha dika ebe-ulo-ikwū nile ha si di n'ókè-ala nile ha: enyere umu Eron, bú ab͕uru ndi Kohat, n'ihi na ha nwere ife-nzà mbu,

55. ha we nye ha Hebron n'ala Juda, na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya;

56. ma ha nyere Keleb nwa Jefune ọhia obodo ahu, na obodo ntà ya nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 6