Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 5:22-26 Bible Nso (IGBOB)

22. N'ihi na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u dara, n'ihi na agha ahu sitere na Chineke. Ha we biri n'ọnọdu ha rue mb͕e emere ka ha je biri n'ala ọzọ.

23. Umu nkera ebo Manase biri kwa n'ala ahu: site na Beshan rue Beal-heamon na Senia na ugwu Heamon ka ndi ahu bara uba.

24. Ma ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, bú Ifa, na Ishi, na Eliel, na Azriel, na Jeremaia, na Hodavaia, na Jahdiel, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom amara aha-ha, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha.

25. Ha we mekpue emekpu megide Chineke nke ndi bu nna-ha, soro chi nile nke ndi ala ahu kwa iko, bú ndi Chineke kpochapuru n'iru ha.

26. Chineke Israel we kpọte mọ Pul, bú eze Asiria, na mọ Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, o we me ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, o we me ka ha biarue Hala, na Haboa, na Hara, na osimiri Gozan, rue ta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 5