Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 5:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma umu-ndikom Reuben ọkpara Israel, (n'ihi na onye ahu bu ọkpara; ma, n'ihi na o mere ute nna-ya ka ọ ghara idi nsọ, enyere umu Josef nwa Israel ọnọdu-ọkpara-ya; agaghi-ede kwa ya n'akwukwọ-osuso-ọmumu dika ọnọdu-ọkpara si di.

2. N'ihi na Juda di ike n'etiti umu-nne-ya, onye-ndú we si nime ya puta; ma Josef nwere ọnọdu-ọkpara:)

3. umu-ndikom Reuben ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami.

4. Umu-ndikom Joel; Shemaia nwa-ya, Gog nwa-ya, Shimai nwa-ya;

5. Maika nwa-ya, Reaia nwa-ya, Beal nwa-ya;

6. Beera nwa-ya, onye Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, mere ka ọ je biri n'ala ọzọ: onye ahu bu onye-isi ndi Reuben nwere.

7. Na umu-nne-ya ndikom dika ab͕uru nile ha si di, mb͕e edere akwukwọ-osuso-ọmumu nke osuso-ọmumu nile ha; onye-isi, bú Jeiel, na Zekaraia,

8. na Bela nwa Azaz, nwa Shema, nwa Joel, onye ahu bi n'Aroea, we rue Nebo na Beal-meon:

9. ma n'ọwuwa-anyanwu o biruru nbata ọzara, bú site n'osimiri Yufretis: n'ihi na anu-ulo-ha bara uba n'ala Gilead.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 5