1. Ma umu-ndikom Reuben ọkpara Israel, (n'ihi na onye ahu bu ọkpara; ma, n'ihi na o mere ute nna-ya ka ọ ghara idi nsọ, enyere umu Josef nwa Israel ọnọdu-ọkpara-ya; agaghi-ede kwa ya n'akwukwọ-osuso-ọmumu dika ọnọdu-ọkpara si di.
2. N'ihi na Juda di ike n'etiti umu-nne-ya, onye-ndú we si nime ya puta; ma Josef nwere ọnọdu-ọkpara:)
3. umu-ndikom Reuben ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami.
4. Umu-ndikom Joel; Shemaia nwa-ya, Gog nwa-ya, Shimai nwa-ya;
5. Maika nwa-ya, Reaia nwa-ya, Beal nwa-ya;
6. Beera nwa-ya, onye Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, mere ka ọ je biri n'ala ọzọ: onye ahu bu onye-isi ndi Reuben nwere.