Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 26:15-27 Bible Nso (IGBOB)

15. Ife-nzà nke Obed-edom putara n'akuku Ndida; nke umu-ya ndikom puta-kwa-ra n'ulo nchikọta-ihe.

16. Nke Shupim na nke Hosa putara n'Ọdida-anyanwu, n'akuku ọnu-uzọ-ama Shaleket, n'uzọ atuliri atuli nke nārigo, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.

17. Ndi Livai isi nọ n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'akuku Ugwu ha di anọ kwa-ubọchi, n'akuku Ndida ha di anọ kwa-ubọchi, ha di-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe abua abua kwa-ubọchi.

18. N'èzí ulo n'akuku Ọdida-anyanwu ha di anọ n'uzọ atuliri atuli, abua n'èzí ulo.

19. Ndia bu òkè ndi-ọnu-uzọ-ama; nke umu ndi Kora, na nke umu Merari.

20. Nime ndi Livai, Ahaija bu onye-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke, ọbuná idebe ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile.

21. Umu-ndikom Ladan; umu ndi Giashon, bú ndi Ladan nwere, ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Ladan onye Giashon nwere; Jehieli.

22. Umu-ndikom Jehieli; Zitam, na Joel nwa-nne-ya, bú ndi-isi ulo-àkù nile nke ulo Jehova.

23. Nke ndi Amram, nke ndi Izha, nke ndi Hebron, nke ndi Uziel:

24. Shebuel nwa Giashon, nwa Moses, bu kwa onye-isi ulo-àkù nile.

25. Umu-nne-ya kwa; bú umu nke Elieza: Rehabaia nwa-ya, na Jeshaia nwa-ya, na Joram nwa-ya, na Zikri nwa-ya, na Shelomot nwa-ya.

26. Shelomot nka na umu-nne-ya bu ndi-isi ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile nke Devid, bú eze, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na usu ọgu ndikom ise, na ndi-isi usu-ndi-agha, doro nsọ.

27. Site n'agha-ha nile, bú site n'ihe-nkwata, ka ha doro ya nsọ ime ka ulo Jehova di ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 26