Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 25:7-21 Bible Nso (IGBOB)

7. Ọnu-ọgugu-ha, tiyere umu-nne-ha, ndi ezíworo abù anābùku Jehova, bú ndi nile nwere nghọta, di ọgu iri-na-anọ na asatọ.

8. Ha we fe nzà bayere ihe-ndebe-ha, ha nile n'otù aka ahu, ma onye ntà ma onye uku, onye nwere nghọta tiyere onye anēzí ihe.

9. Ife-nzà mbu nke putara Esaf mara Josef: nke-abua mara Gedalia; ya onwe-ya na umu-nne-ya na umu-ya ndikom di iri na abua:

10. nke-atọ mara Zakua, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

11. nke anọ mara Izri, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

12. nke-ise mara Netanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

13. nke-isi mara Bukia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

14. nke-asa mara Jesharela, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

15. nke-asatọ mara Jeshaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

16. nke-iteghete mara Matanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

17. nke-iri mara Shimai, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

18. nke-iri-na-otù mara Azarel, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

19. nke-iri-na-abua mara Hashabaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

20. n'ife-nzà nke-iri-na-atọ ọ mara Shubael, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

21. nime nke-iri-na-anọ ọ mara Matitaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 25