Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 25:6-14 Bible Nso (IGBOB)

6. Ndia nile nọ n'aka nna-ha n'ibù abù n'ulo Jehova, chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, iji fè òfùfè nke ulo Chineke; ha nọ n'aka eze, bú Esaf, na Jedutun, na Himan.

7. Ọnu-ọgugu-ha, tiyere umu-nne-ha, ndi ezíworo abù anābùku Jehova, bú ndi nile nwere nghọta, di ọgu iri-na-anọ na asatọ.

8. Ha we fe nzà bayere ihe-ndebe-ha, ha nile n'otù aka ahu, ma onye ntà ma onye uku, onye nwere nghọta tiyere onye anēzí ihe.

9. Ife-nzà mbu nke putara Esaf mara Josef: nke-abua mara Gedalia; ya onwe-ya na umu-nne-ya na umu-ya ndikom di iri na abua:

10. nke-atọ mara Zakua, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

11. nke anọ mara Izri, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

12. nke-ise mara Netanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

13. nke-isi mara Bukia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

14. nke-asa mara Jesharela, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 25