Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 25:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid na ndi-isi usu-ndi-agha we kewaputara òfùfè ufọdu nime umu Esaf, na nke Himan, na nke Jedutun, ndi nēwere ubọ-akwara, na une, na ájà, bu amuma: ọnu-ọgugu-ha, bú ndikom nēje ozi dika òfùfè-ha si di, we di:

2. nke umu ndikom Esaf; Zakua, na Josef, na Netanaia, na Asharela, bú umu Esaf; ha nọ n'aka Esaf, onye nēbu amuma n'aka eze.

3. Nke Jedutun: umu-ndikom Jedutun; Gedalaia, na Zeri, na Jeshaia, na Hashabaia, na Matitaia, isi; ha nọ n'aka nna-ha, bú Jedutun, onye nēwere ubọ-akwara bu amuma bayere ikele na ito Jehova.

4. Nke Himan: umu-ndikom Himan; Bukia, na Matanaia, na Uziel, na Shebuel, na Jerimot, na Hananaia, na Hanani, na Eliata, na Gidalti, na Romamti-eza, na Joshbekasha, na Maloti, na Hotia, na Mahaziot:

5. ndia nile bu umu-ndikom Himan, bú onye-ọhu-uzọ eze n'okwu Chineke, iweli mpi elu. Chineke we nye Himan umu-ndikom iri na anọ na umu-ndinyom atọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 25