Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 2:17-23 Bible Nso (IGBOB)

17. Abigail mu-kwa-ra Amasa: ma nna Amasa bu Jeta onye Ishmael.

18. Keleb nwa Hezron muru umu site n'Azuba, bú nwunye-ya, site kwa na Jeriot: ndia bu umu-ndikom nwayi ahu; Jesha, na Shobab, na Adon.

19. Azuba we nwua, Keleb we lutara onwe-ya Efrat, o we muara ya Hua.

20. Hua mua Uri, Uri mua Bezalel.

21. Emesia Hezron bakuru nwa-nwayi Makia, bú nna Gilead; ma nwoke ahu lutara ya mb͕e ya onwe-ya b͕ara ọgu arọ atọ; o we muara ya Segub.

22. Segub we mua Jaia, nke nwere orú obodo na atọ n'ala Gilead.

23. Geshua na Eram we nara ha Havot-jaia, ha na Kenat, na umu-obodo-ya, bú ọgu obodo atọ. Ndia nile bu umu-ndikom Makia nna Gilead.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 2