Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 2:11-22 Bible Nso (IGBOB)

11. Nahshon mua Salma, Salma mua Boaz;

12. Boaz mua Obed, Obed mua Jesi;

13. Jesi mua ọkpara-ya, bú Elaiab, na Abinadab, bú nke-abua, na Shimea, bú nke-atọ;

14. na Netanel, bú nke-anọ, na Radai, bú nke-ise;

15. na Ozem, bú nke-isi, na Devid, bú nke-asa:

16. Umu-nne-ha ndinyom bu Zeruaia na Abigail. Umu-ndikom Zeruaia kwa; Abishai, na Joab, na Asahel, atọ.

17. Abigail mu-kwa-ra Amasa: ma nna Amasa bu Jeta onye Ishmael.

18. Keleb nwa Hezron muru umu site n'Azuba, bú nwunye-ya, site kwa na Jeriot: ndia bu umu-ndikom nwayi ahu; Jesha, na Shobab, na Adon.

19. Azuba we nwua, Keleb we lutara onwe-ya Efrat, o we muara ya Hua.

20. Hua mua Uri, Uri mua Bezalel.

21. Emesia Hezron bakuru nwa-nwayi Makia, bú nna Gilead; ma nwoke ahu lutara ya mb͕e ya onwe-ya b͕ara ọgu arọ atọ; o we muara ya Segub.

22. Segub we mua Jaia, nke nwere orú obodo na atọ n'ala Gilead.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 2