11. O tiye ndi Israel fọduru n'aka Abishai, bú nwa-nne-ya, ha we do onwe-ha n'usoro izute umu Amon.
12. Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m'gāzọputa kwa gi.
13. Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya.
14. Joab na ndi soro ya we biarue nso n'iru ndi Siria ibu agha; ha we b͕alaga n'iru ya.