Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 17:10-22 Bible Nso (IGBOB)

10. na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel: emewokwam ka ndi-iro-gi nile ruru ala. Anamegosi kwa gi na Jehova gēwuru gi ulo.

11. Ọ gēru kwa, mb͕e ubọchi-gi zuru ijeso nna-gi-hà, na M'gēme ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, onye gēsite n'umu-gi ndikom; M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.

12. Onye ahu gēwurum ulo, M'gēme kwa ka oche-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.

13. Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa: M'gaghi-ewezuga kwa eberem n'ebe ọ nọ, dika M'wezugara ya n'ebe ọ nọ, bú onye buru gi uzọ:

14. ma M'gēme ka o nēguzo n'ulom na n'ala-ezem rue mb͕e ebighi-ebi: agēme kwa ka oche-eze-ya buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.

15. Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu.

16. Devid, bú eze, we ba, nọdu ala n'iru Jehova; ọ si, Ònye ka m'bu, Jehova, bú Chineke, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m'biarue na mb͕e a?

17. Ma nka bu ihe ntà n'anya-gi, Chineke; I we kwue okwu bayere ulo orù-Gi rue mb͕e di anya, I huwokwam dika ọnọdu nke madu nọ n'elu si di, Jehova, bú Chineke.

18. Gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ bayere nsọpuru orù-Gi? n'ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi.

19. Jehova, n'ihi orù-Gi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka amara ihe uku ndia nile.

20. Jehova, ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi.

21. Ma òle mba di ka ndi-Gi, bú Israel, nke bu otù mba nke nēguzo iche n'uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ibu otù ndi, imere Onwe-gi aha site n'ihe-idi-uku na ihe di egwu, ichupu mba di iche iche n'iru ndi-Gi, ndi I siri n'Ijipt b͕aputa?

22. I we doro Onwe-gi ndi-Gi, bú Israel, ibu otù ndi rue mb͕e ebighi-ebi; Gi onwe-gi, Jehova, we ghọrọ ha Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 17