29. Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bia n'iru Ya:Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.
30. Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile:Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya.
31. Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;Ka ha si kwa n'etiti mba nile, Jehova bu eze.
32. Ka oké osimiri bib͕ọ, ya na ùjú-ya;Ka obi tọ ọhia utọ, ya na ihe nile nke di nime ya;
33. Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù n'iru Jehova,N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe.
34. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
35. Si-kwa-nu, Zọputa ayi, Chineke nzọputa-ayi,Chikọta kwa ayi, naputa ayi n'aka mba nile,Ikele aha nsọ Gi,Na inya isi n'otuto-Gi.
36. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu,Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.Ndi Israel nile we si, Amen, ha we to Jehova.
37. O we rapu n'ebe ahu, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, Esaf na umu-nne-ya, ije ozi n'iru ib͕e ahu mb͕e nile, dika ihe ubọchi n'ubọchi-ya si di:
38. na Obed-edom na umu-nne-ha, ọgu ndikom atọ na asatọ; na Obed-edom nwa Jedutun, na Hosa, ibu ndi-ọnu-uzọ-ama:
39. na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, n'iru ebe-obibi Jehova n'ebe di elu nke di na Gibeon,
40. isurere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku mb͕e nile n'ututu na n'anyasi, ọbuná dika ihe nile si di nke edeworo n'iwu Jehova, nke O nyere Israel n'iwu;
41. ha na Himan na Jedutun, na ndi fọduru nime ndi arọputara arọputa, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di;
42. ha na Himan na Jedutun, ndi chiri opì na ájà inye ndi nēme ka anu udà-ha, chiri kwa ihe abù Chineke: na umu Jedutun, inọ n'ọnu-uzọ-ama.
43. Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n'ulo-ya: Devid we lata igọzi ulo-ya.