Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 16:28-34 Bible Nso (IGBOB)

28. Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

29. Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bia n'iru Ya:Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.

30. Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile:Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya.

31. Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;Ka ha si kwa n'etiti mba nile, Jehova bu eze.

32. Ka oké osimiri bib͕ọ, ya na ùjú-ya;Ka obi tọ ọhia utọ, ya na ihe nile nke di nime ya;

33. Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù n'iru Jehova,N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe.

34. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 16