24. Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n'etiti mba nile,Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.
25. N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n'elu chi nile.
26. N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:Ma Jehova mere elu-igwe.
27. Ebube na ima-nma di n'iru Ya:Ike na ọṅù di n'ebe-Ya.
28. Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,Nyenu Jehova nsọpuru na ike.
29. Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bia n'iru Ya:Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.
30. Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile:Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya.
31. Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;Ka ha si kwa n'etiti mba nile, Jehova bu eze.
32. Ka oké osimiri bib͕ọ, ya na ùjú-ya;Ka obi tọ ọhia utọ, ya na ihe nile nke di nime ya;
33. Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù n'iru Jehova,N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe.
34. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
35. Si-kwa-nu, Zọputa ayi, Chineke nzọputa-ayi,Chikọta kwa ayi, naputa ayi n'aka mba nile,Ikele aha nsọ Gi,Na inya isi n'otuto-Gi.