Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 15:8-13 Bible Nso (IGBOB)

8. nke umu Elizafan; Shemaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri:

9. nke umu Hebron; Eliel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom anọ:

10. nke umu Uziel; Aminadab, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom ise na iri na abua.

11. Devid we kpọ Zedok, kpọ kwa Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, kpọ kwa ndi Livai, bú Uriel, na Asaia, na Joel, na Shemaia, na Eliel, na Aminadab,

12. si ha, Unu onwe-unu bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai: donu onwe-unu nsọ, unu onwe-unu na umu-nne-unu, ka unu we bugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel, rue ebe m'doziri nye ya.

13. N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu būru ya na mbu, n'ihi ya ka Jehova, bú Chineke-ayi, tiwaputara megide ayi, n'ihi na ayi achọghi Ya dika ikpé-Ya si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 15