Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 14:7-11 Bible Nso (IGBOB)

7. na Elishama, na Beeliada, na Elifelet.

8. Ndi Filistia we nu na etere Devid manu ibu eze Israel nile, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid: Devid we nu ya, we pua n'iru ha.

9. Ma ndi Filistia biara, nọdu na ndagwurugwu Refaim.

10. Devid we jua Chineke ase, si, M'gārigo imegide ndi Filistia? Ì gēnye kwa ha n'akam? Jehova we si ya, Rigo; M'gēnye kwa ha n'aka-gi.

11. Ha we rigorue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; Devid we si, Jehova ekwopúwo megide ndi-irom site n'akam, dika nkwopú miri. N'ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 14