2. Devid we mara na Jehova emewo ya ka o guzosie ike ibu eze Israel, n'ihi na ebuliwo ala-eze-ya n'elu n'ihi ndi-Ya, bú Israel.
3. Devid we kuru ndinyom ọzọ nime Jerusalem: Devid we mua umu-ndikom na umu-ndinyom ọzọ.
4. Ndia bu kwa aha umu o nwere na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon;
5. na Ibha, na Elishua, na Elpelet;