1. Ma ndia bu ndi nābiakute Devid rue Ziklag, mb͕e anọ̀ nēmechibido ya n'ihi Sọl nwa Kish: ndi ahu di kwa n'etiti ndi-dike-ya, ndi nēyere ya aka n'agha ahu.
2. Ha nāchi uta, nēme aka-nri nēme kwa aka-ekpe n'itu nkume na n'iwere uta b͕a àkú; ha sitere n'umu-nne Sọl site na Benjamin.
3. Onye-isi bu Ahieza, na Joash, bú umu Shemaa onye Gibea; na Jeziel, na Pelet, bú umu Azmavet; na Beraka, na Jihu onye Anatot;
4. na Ishmaia onye Gibeon, bú dike n'etiti orú ndikom na iri ahu, na onye-isi orú na iri ahu; na Jeremaia, na Jahaziel, na Johanan, na Jozabad onye Gedira;