1. Ma ndia bu ndi nābiakute Devid rue Ziklag, mb͕e anọ̀ nēmechibido ya n'ihi Sọl nwa Kish: ndi ahu di kwa n'etiti ndi-dike-ya, ndi nēyere ya aka n'agha ahu.
2. Ha nāchi uta, nēme aka-nri nēme kwa aka-ekpe n'itu nkume na n'iwere uta b͕a àkú; ha sitere n'umu-nne Sọl site na Benjamin.
3. Onye-isi bu Ahieza, na Joash, bú umu Shemaa onye Gibea; na Jeziel, na Pelet, bú umu Azmavet; na Beraka, na Jihu onye Anatot;
4. na Ishmaia onye Gibeon, bú dike n'etiti orú ndikom na iri ahu, na onye-isi orú na iri ahu; na Jeremaia, na Jahaziel, na Johanan, na Jozabad onye Gedira;
5. Eluzai, na Jerimot, na Bealia, na Shemaraia, na Shefataia onye-Harufait;
6. Elkena, na Ishia, na Azarel, na Joeza, na Jashọbeam, bú ndi Kora;
7. na Joela, na Zebadaia, bú umu Jeroham nke Gedoa.
8. Ufọdu nime ndi Gad kewaputa-kwa-ra onwe-ha jekuru Devid rue ebe ahu ewusiri ike n'ọzara, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom usu-ndi-agha ibu agha, ndi nēdo ọta na ube n'usoro; iru-ha bu kwa iru ọdum, ha di kwa ngwa dika mb͕ada n'elu ugwu;
9. Iza, bú onye-isi, Obadaia, bú nke-abua, Elaiab, bú nke-atọ;
10. Mishmana, bú nke-ano, Jeremaia, bú nke-ise;
11. Atai, bú nke-isi, Eliel, bú nke-asa;