Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 11:8-20 Bible Nso (IGBOB)

8. O we wue obodo buruburu, site na Milo we rue buruburu ya: ma Joab mere ka obodo fọduru di ndu.

9. Devid we nāga n'iru, nēje nādi uku; Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọye-kwa-ra ya.

10. Ma ndia bu ndi-isi nke ndi-dike Devid nwere, ndi mere onwe-ha ka ha di ike n'akuku ya n'ala-eze-ya, ha na Israel nile, ime ya eze, dika okwu Jehova si di bayere Israel.

11. Nka bu kwa ọnu-ọgugu ndi-dike Devid nwere: Jashọbeam, bú nwa onye-Hakmonait, onye-isi nke orú na iri ahu; o feghariri ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u n'otù ub͕ò.

12. Nke so ya bu Eleeza nwa Dodo, onye Ahoa, onye ahu di n'etiti ndi-dike atọ ahu.

13. Onye ahu nọyere Devid nime Pas-damim, ma ndi Filistia chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, òkè ubi nke juputara n'ọka barley di kwa; ma ndi Israel b͕alagara n'iru ndi Filistia.

14. Ha we guzo onwe-ha n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia; Jehova we zọputa nzọputa uku.

15. Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we ridarue oké nkume ahu jekuru Devid, rue ọb͕à Adulam; ma ọmuma-ulo-ikwū ndi-Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim.

16. Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.

17. Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m'ṅua miri sitere n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama?

18. Ndikom atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma Devid ekweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova,

19. si, Ya burum ihe-árú sitere na Chinekem, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha je? n'ihi na ha ji ndu-ha n'aka-ha kute ya. O kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.

20. Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu: onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 11