Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 10:4-11 Bible Nso (IGBOB)

4. Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa nma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya.

5. Onye nēbu ihe-agha-ya we hu na Sọl anwuwo, ya onwe-ya we dakwasi kwa na mma-agha-ya, nwua.

6. Sọl we nwua, ya na umu-ya ndikom atọ; ulo-ya nile nwu-kwa-ra n'otù.

7. Ndikom Israel nile ndi nọ na ndagwurugwu ahu we hu na ha ab͕alagawo, na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo kwa, ha we rapu obodo nile ha b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.

8. O rue, n'echi-ya, mb͕e ndi Filistia biaru ibupu ihe ndi eb͕uru eb͕u, na ha huru Sọl ma umu-ya ndikom ka ha tọb͕ọrọ n'ugwu Gilboa.

9. Ha we yipu ihe-agha-ya, būru isi-ya na ihe-agha-ya, ziga n'ala ndi Filistia buruburu, izisara arusi nile ha na ndi-ha ozi ahu.

10. Ha we dọba ihe-agha-ya n'ulo chi-ha, kpọgide okpokoro-isi-ya n'ulo Degon.

11. Jebesh-gilead nile we nu ihe nile ndi Filistia mere Sọl,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 10