Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 10:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi Filistia busoro Israel agha: ndikom Israel we b͕alaga n'iru ndi Filistia, ha we da, buru ndi eb͕uru eb͕u n'ugwu Gilboa.

2. Ndi Filistia we sosie ike n'azu Sọl na n'azu umu-ya ndikom; ndi Filistia we tib͕ue Jonatan, na Abinadab, na Malki-shua, bú umu-ndikom Sọl.

3. Agha ahu we di arọ́ megide Sọl, ndi-ọb͕a-uta we huta ya; o we nēb͕u ya nb͕u site n'ib͕a-uta nke ndi-ọb͕a-uta.

4. Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa nma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya.

5. Onye nēbu ihe-agha-ya we hu na Sọl anwuwo, ya onwe-ya we dakwasi kwa na mma-agha-ya, nwua.

6. Sọl we nwua, ya na umu-ya ndikom atọ; ulo-ya nile nwu-kwa-ra n'otù.

7. Ndikom Israel nile ndi nọ na ndagwurugwu ahu we hu na ha ab͕alagawo, na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo kwa, ha we rapu obodo nile ha b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.

8. O rue, n'echi-ya, mb͕e ndi Filistia biaru ibupu ihe ndi eb͕uru eb͕u, na ha huru Sọl ma umu-ya ndikom ka ha tọb͕ọrọ n'ugwu Gilboa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 10