Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 1:33-45 Bible Nso (IGBOB)

33. Umu-ndikom Midian; Ifa, na Ifea, na Hanok, na Abida, na Eldea. Ndia nile bu umu Ketura.

34. Abraham muru Aisak. Umu-ndikom Aisak; Isọ, na Israel.

35. Umu-ndikom Isọ; Elifaz, na Reuel, na Jeush, na Jalam, na Kora.

36. Umu-ndikom Elifaz; Timan, na Oma, na Zefi, na Gatam, na Kenaz, na Timna, na Amalek.

37. Umu-ndikom Reuel; Nahat, na Zera, na Shama, na Miza.

38. Umu-ndikom Sia kwa; Lotan, na Shobal, na Zibeon, na Ana, na Dishon, na Iza, na Dishan.

39. Umu-ndikom Lotan kwa; Hori, na Homam: nwa-nne-nwayi Lotan bu kwa Timna.

40. Umu-ndikom Shobal; Alian, na Manahat, na Ibal, na Shefi, na Onam. Umu-ndikom Zibeon kwa; Aja, na Ana.

41. Umu-ndikom Ana; Dishon. Umu-ndikom Dishon kwa; Hamran, na Eshban, na Itran, na Keran.

42. Umu-ndikom Iza; Bilhan, na Zaavan, na Jaakan. Umu-ndikom Dishan; Uz, na Aran.

43. Ndia bu eze ndi bu eze n'ala Edom, tutu eze ọ bula bu eze umu Israel: Bela nwa Beoa; aha obodo-ya bu Dinhaba.

44. Bela we nwua, Jobab nwa Zera, nke sitere na Bọzra, we buru eze n'ọnọdu ya.

45. Jobab we nwua, Husham, nke sitere n'ala ndi Timan, we buru eze n'ọnọdu ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 1