7. Ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo. Unu atula egwu: ọnu-ahia-unu kariri nke ọtutu egwele.
8. Ma asim unu, Onye ọ bula nke gēkwuputam n'iru madu, ya ka Nwa nke madu gēkwuputa kwa n'iru ndi-mọ-ozi nke Chineke:
9. ma onye gāgọnarim n'iru madu, agāgọnari ya n'iru ndi-mọ-ozi nke Chineke.
10. Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya: ma agaghi-ab͕aghara onye gēkwulu Mọ Nsọ.
11. Ma mb͕e ọ bula ha kpọrọ unu bia n'iru ulo-nzukọ, na ndi-isi, na ndi nāchi isi, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gāgọpu onwe-unu ma-ọbu ihe unu gēji gọpu onwe-unu, ma-ọbu ihe unu gēkwu:
12. n'ihi na Mọ Nsọ gēzí unu n'oge hour ahu ihe unu nāghaghi ikwu.
13. Ma otù onye sitere n'igwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, gwa nwa-nnem nwoke ka o kère ihe-nketa-ayi nyem.
14. Ma Ọ siri Ya, Nwoke, ònye merem ka M'buru onye-ikpé ma-ọbu onye-òkìkè n'ebe unu nọ?
15. O we si ha, Lezienu anya, debe-kwa-nu onwe-unu ka unu ghara inwe anya-uku ọ bula: n'ihi na ọ bughi n'ihe ọ nwebigara ókè ka ndu madu di, o sighi n'ihe o nwere puta.
16. O we turu ha ilu, si, Ala otù ọgaranya miri nkpuru ri nne:
17. o we tugharia n'obi-ya, si, Gini ka m'gēme, n'ihi na enweghm ebe ikpokọta nkpurum?
18. O we si, Nka ka m'gēme: m'gēweda ọbam, wu kwa nke ka uku; n'ebe ahu ka m'gēkpokọta ọkam nile na ezi ihem nile.
19. M'gāsi kwa nkpuru-obim, Nkpuru-obi, i nwere ọtutu ezi ihe edebere nye gi rue ọtutu arọ; nēzu ike, nēri ihe, nāṅu ihe-ọṅuṅu, ka obi nātọ gi utọ.
20. Ma Chineke siri ya, Onye nēnweghi uche, n'abali a ka anāchọ mkpure-obi-gi n'aka-gi; ma ihe i doziri, ònye gēnwe ha?
21. Otú a ka ọ di, bú onye nākpadoro onwe-ya àkù, ma ọ bughi ọgaranya n'ebe Chineke nọ.
22. Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi.