Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jud 1:9-16 Bible Nso (IGBOB)

9. Ma Maikael onye-isi-mọ-ozi, mb͕e ya na ekwensu nārurita uka banyere aru Moses, ka ọ nēkwugide ya, o nweghi anya-ike ikpe ya ikpé nkwulu, kama ọ siri, Ka Onye-nwe-ayi bara gi nba.

10. Ma ndia nēkwulu ihe nile, ka ha ra, bú ihe ha nāmatagh: ma ka ha ra, bú ihe ha nāghọta site n'ọmumu, dika anu nēnweghi uche, nime ihe ndia ka anēmebi ha.

11. Ahuhu gādiri ha, n'ihi na ha gara n'uzọ Ken, wusì kwa onwe-ha dika miri na njehie nke Belam n'ihi ugwọ-ọlu, we la n'iyì na nkwugide nke Kora.

12. Ndia bu ndi nke bu nkume zoro ezo n'oriri ihu n'anya unu mb͕e ha nēso unu rikọ ihe nātughi egwu, ndi nāzù onwe-ha dika aturu; ha bu igwe-oji nke miri nādighi, nke ifufe nēfeghari; buru kwa osisi nāmighi nkpuru n'oge nkpuru, nke nwuru anwu ub͕ò abua, nke eropuru eropu;

13. buru kwa ebili-miri di egwu nke oké osimiri, nāsuputa ihere nke aka ha dika ufufu; umu-kpakpando nējehie ejehie, ndi edebeworo itiri nke ọchichiri rue mb͕e ebighi-ebi.

14. Ọ bu kwa ndia ka Inok, bú onye-asa site n'Adam, buru amuma, si, Le, Onye-nwe-ayi biara Ya na ndi nsọ Ya, anāpughi iguta ọnu,

15. ikpe madu nile ikpé, na itu ndi nile ndi nāsọpurughi Chineke ihe n'anya, bú ọlu nile nke asọpughi-Chineke ha nke ha luru n'asọpughi-Chineke, ha na okwu di ike nile nke ndi-nmehie ndi nāsọpurughi Chineke kwugidere Ya.

16. Ndia bu ndi-ntamu, ndi nāta Chineke uta, nējeso agu ihe ọjọ nile ha (ọnu-ha nēkwu kwa oké okwu nāfuli afuli), ndi nāja iru madu n'ihi urù.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jud 1