12. Ma ayi nēkpere unu, umu-nna-ayi, ka unu mata ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu n'etiti unu, ndi bu kwa ndi-isi-unu nime Onye-nwe-ayi, ndi nādu kwa unu ọdú;
13. ka unu were kwa ihunanya sọpuru ha gabiga ókè nke-uku ri nne n'ihi ọlu-ha. Birinu n'udo n'etiti onwe-unu.
14. Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n'obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n'ebe madu nile nọ.
15. Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ.
16. Nāṅurinu ọṅu mb͕e nile;
17. nēkpenu ekpere nēwepughi aka;
18. nēkelenu ekele n'ihe nile ọ bula: n'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n'ebe unu nọ.
19. Unu emenyula Mọ Nsọ;
20. unu akpọla ibu-amuma ihe-efu;
21. nānwanu ihe nile; jidesienu ihe ọma ike;
22. unu etiyela aka n'aha ajọ ihe ọ bula.
23. Chineke nke udo, Ya Onwe-ya dozu kwa unu nsọ n'uzọ dum; ka edebezu kwa mọ-unu na nkpuru-obi-unu na aru-unu dum, nādighi ita uta n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.