31. Nka bu kwa ihe-ndebe nke ibu-ha, dika òfùfè-ha nile si di n'ulo-ikwū nzute; ibo nile nke ebe-obibim, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile;
32. na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha, tiyere ihe-ha nile, tiyere kwa òfùfè-ha nile: n'aha n'aha ka unu gāgukọta ihe nke ihe-ndebe nke ibu-ha.
33. Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke umu Merari, dika òfùfè-ha nile si di, n'ulo-ikwū nzute, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.
34. Moses na Eron na ndi-isi nzukọ Israel we gukọta umu ndi Kohat dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,
35. site n'onye b͕ara orú arọ na iri gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute:
36. ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, di nnù isi na ọgu iri-na-asa na iri.
37. Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke ndi Kohat, onye ọ bula nke nēfè òfùfè n'ulo-ikwū nzute, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.
38. Ndi agukọtara agukọta nke umu Giashon, dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,
39. site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute,
40. ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, di nnù isi na ọgu iri-na-otù na iri.
41. Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke umu Giashon, onye ọ bula nke n-efè òfùfè n'ulo-ikwū nzute, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova.
42. Ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,
43. site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute,
44. ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, di nnù asatọ.
45. Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile umu Merari, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.