27. Belak we si Belam, Biko, bia, m'gēkuru gi je ebe ọzọ; eleghi anya ọ gēzi ezi n'anya Chineke ka i si n'ebe ahu kọcharam ha.
28. Belak we kuru Belam je n'elu Peoa, nke nēle anya n'ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu di.
29. Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n'ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n'ebe a.
30. Belak we me dika Belam siri, ọ we sure otù oke-ehi na otù ebulu n'ebe-ichu-aja ọ bula.