18. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Efraim, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, di n'akuku Ọdida-anyanwu: onye-isi umu Efraim nwere bu Elishama nwa Amihud.
19. Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù na ọgu ise.
20. N'akuku-ya ka ebo Manase di: onye-isi umu Manase nwere bu Gameliel nwa Pedahzua:
21. Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ anọ, na ọgu iri:
22. ebo Benjamin kwa: onye-isi umu Benjamin nwere bu Abidan nwa Gideoni:
23. Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ anọ na nnù asatọ na ọgu iri.
24. Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Efraim di orú nnù uzọ iri-na-atọ, na nnù iri, na ọgu ise, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gābu nke-atọ n'ibuli ije.
25. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Dan di n'akuku Ugwu, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; onye-isi umu Dan nwere bu Ahieza nwa Amishadai.