10. Site na ndi-nchu-àjà: Jedaia nwa Joiarib, na Jakin,
11. na Seraia nwa Hilkaia, nwa Meshulam, nwa Zedok, nwa Meraiot, nwa Ahaitub, bú onye-ndú ulo Chineke,
12. na umu-nne-ha ndi nēje ozi ulo ahu, nnù abua na orú na abua: na Adaia nwa Jeroham, nwa Pelalia, nwa Amzi, nwa Zekaraia, nwa Pashua, nwa Malkija,
13. na umu-nne-ya, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, ọgu iri-na-abua na abua: na Amashsai nwa Azarel, nwa Ahzai, nwa Meshilemot, nwa Imea,
14. na umu-nne-ha, bú ndi-dike bu dìnkpà, ọgu isi na asatọ: onye nēlekọta ha bu Zabdiel nwa Hagedolim.
15. Site kwa na ndi Livai: Shemaia nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaia, nwa Buni;
16. na Shabetai, na Jozabad, ndi sitere na ndi-isi ndi Livai, ndi bu ndi-isi nke ije-ozi nke èzí diri ulo Chineke;
17. na Matanaia nwa Maika, nwa Zabdi, nwa Esaf, onye bu isi nāmalite ikele ekele n'ekpere, na Bakbukia, bú onye nke-abua n'umu-nne-ya; na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun.
18. Ndi Livai nile n'obodo nsọ ahu di ọgu iri-na-anọ na anọ.
19. Ọzọ, ndi-ọnu-uzọ-ama, bú Akub, na Talmon, na umu-nne-ha, ndi nēche nche n'ọnu-uzọ-ama nile, di ọgu asatọ na iri na abua.
20. Ma ndi fọduru nke Israel, na nke ndi-nchu-àjà, na nke ndi Livai, nọ n'obodo nile nke Juda, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya.