24. Ndi nēche nche we hu otù nwoke ka o nēsi n'obodo ahu puta, ha we si ya, Biko, gosi ayi nbata obodo a, ayi gēme-kwa-ra gi ebere.
25. Ọ we gosi ha nbata obodo ahu, ha we were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu; ma ha zipuru nwoke ahu na ab͕uru-ya nile.
26. Nwoke ahu we je ala ndi Het, wue obodo, kpọ aha-ya Luz: nke ahu bu aha-ya rue ta.
27. Manase anapughi ndi bi na Bet-shan na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, ala-ha: ma ndi Kenean jisiri ike ibiri n'ala ahu.
28. O rue, mb͕e Israel di ike, na ha tiyere ndi Kenean n'ifè-òfùfè, ma ha anapusighi ha ala-ha.
29. Efraim anapughi kwa ndi Kenean ndi bi na Gezea ala-ha; ndi Kenean we biri na Gezea n'etiti ha.
30. Zebulun anapughi ndi bi na Kitron, na ndi bi na Nahalol, ala-ha; ndi Kenean we biri n'etiti ha, ghọ ndi nọ n'ifè-òfùfè.
31. Asha anapughi kwa ndi bi n'Ako, na ndi bi na Zaidon, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, na Rehob, ala-ha:
32. ndi Asha we biri n'etiti ndi Kenean, bú ndi bi n'ala ahu: n'ihi na ha anapughi ha ala-ha.
33. Naftali anapughi kwa ndi bi na Bet-shemesh, na ndi bi na Bet-anat, ala-ha; ha we biri n'etiti ndi Kenean, bú ndi bi na n'ala ahu: ma ndi bi na Bet-shemesh na Bet-anat ghọrọ ndi nēfè ha òfùfè.
34. Ndi-Amorait we kpagide umu Dan n'ugwu: n'ihi na ha ekweghi ka ha rida na ndagwurugwu:
35. ma ndi-Amorait jisiri ike ibiri n'ugwu Heres, na n'Ajalon, na nime Shaalbim: ma aka ulo Josef dikariri arọ́, ha we ghọ ndi nọ n'ifè-òfùfè.
36. Ókè-ala ndi-Amorait we site na nrigo Akrabim, site na ukume di elu ahu, we rigo.