29. ókè-ala ahu we chigharia rue Rema, ru kwa obodo ahu ewusiri ike, bú Taia; ókè-ala ahu we chigharia rue Hosa; ọpupu-ya di kwa n'oké osimiri site na Hebel rue Akzib:
30. na Uma, na Efek, na Rehob: orú obodo na abua na obodo ntà ha.
31. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.
32. Ọ bu umu Naftali ka ife-nzà nke-isi putara, bú umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di.
33. Ókè-ala-ha we site na Helef, site n'osisi terebinth nime Zaananim, na Adami-nekeb, na Jabneel, rue Lakum; ọpupu-ya we di na Jọdan:
34. ókè-ala ahu we chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu rue Aznot-teboa, si n'ebe ahu pua rue Hukok; ọ metu Zebulun na Ndida, metu kwa Asha n'Ọdida-anyanwu, metu kwa Juda n'akuku Jọdan n'ọwuwa-anyanwu.
35. Obodo ewusiri ike bu Zidim, na Zea, na Hamat, na Rakat, na Kineret;
36. na Adama, na Rema, na Hezoa;
37. na Kedesh, na Edrei, na En-hezoa;
38. na Iron, na Migdal-el, na Horem, na Bet-anat, na Bet-shemesh; obodo iri na iteghete na obodo ntà ha.
39. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha.
40. Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara.