22. N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya,Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú.
23. Ibewa urù anu-aru-ya rapara n'aru onwe-ha:O siri ike n'aru ya; agaghi-emeghari ya.
24. Obi-ya siri ike dika nkume;O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri.
25. Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ:Site n'imebi-obi ha nēsihie uzọ.
26. Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike;Ya na ube, na àkú, na uwe-agha.
27. Ọ nāgu ígwè n'okporo-ọka,Nāgu kwa ọla n'osisi rere ure.
28. Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga:Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka.
29. Anāgu ndele n'ahihia-ọka:Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì.
30. Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ:Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti.
31. Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite:Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ.
32. Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya;Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ.
33. Ọ dighi nke di ka ya n'elu ájá uwa,Nke emeworo nēnweghi ujọ.