13. Ònye kpugheworo iru uwe-ya?Ònye gābà n'ab͕a-ya apiajiri okpùkpù abua?
14. Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya?Ezé-ya di oké ujọ buruburu.
15. Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya,Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya.
16. Dika otù si nọ ibe-ya nso,Ifufe adighi-abà n'etiti ha.
17. Anēme ka otù rapara n'aru nwa-nne-ya;Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha.
18. Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu,Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ.
19. N'ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa,Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha.
20. N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa,Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere.
21. Iku-ume-ya nāmunye icheku,Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta.
22. N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya,Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú.
23. Ibewa urù anu-aru-ya rapara n'aru onwe-ha:O siri ike n'aru ya; agaghi-emeghari ya.
24. Obi-ya siri ike dika nkume;O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri.
25. Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ:Site n'imebi-obi ha nēsihie uzọ.
26. Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike;Ya na ube, na àkú, na uwe-agha.
27. Ọ nāgu ígwè n'okporo-ọka,Nāgu kwa ọla n'osisi rere ure.
28. Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga:Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka.
29. Anāgu ndele n'ahihia-ọka:Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì.
30. Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ:Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti.