1. Elaihu we nēkwu kwa, si,
2. Cherem nwa mb͕e ntà, m'gēkwuputa-kwa-ra gi;N'ihi na okwu ọzọ di ikwuru Chineke.
3. M'gēsi n'ebe di anya bute ọmuma-ihem,Ọ bu kwa Onye kpurum ka m'gēnye ezi omume.
4. N'ihi na n'ezie ọ bughi okwu-ugha ka okwum nile bu:Onye zuru okè n'ọmuma-ihe nọyere gi.
5. Le, Chineke di ike, Ọ dighi-aju kwa onye ọ bula:Ọ di ike n'ike nke obi.
6. Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu:Ma Ọ nēnye ndi ewedara n'ala ezi ikpé.
7. Ọ dighi-esepu anya-Ya n'aru onye ezi omume:Ma ọbuná n'ebe ndi-eze nọ n'oche-ezeKa Ọ nēme ka ha nọkwasi rue mb͕e ebighi-ebi, ha we di elu.
8. Ma ọ buru na ejide ha n'udọ̀ nke nweda-n'ala,Dika ndi ekeworo ab͕u nime nkpọrọ-ukwu;