2. Chineke nādi ndu, Onye wezugara ikpém;Onye puru ime ihe nile nādi kwa ndu, bú Onye mere ka nkpuru-obim di ilu;
3. (N'ihi na ogologo mb͕e nile umem di nimem,Mọ nke Chineke di kwa n'imem;)
4. N'ezie eb͕ub͕ere-ọnum adighi-ekwu okwu ajọ omume,Irem adighi-atamu kwa ntamu aghughọ.
5. Ya burum ihe-árú ọ buru na aguam unu na ndi ezi omume:Rue mb͕e m'kubìri ume m'gaghi-esi n'ebe m'nọ wezuga izu-okèm.
6. Ezi omumem ka m'jideworo, m'gaghia ara kwa ya aka:Obim adighi-atam uta bayere otù n'ubọchim nile.
7. Ka onye-irom di ka onye nēmebi iwu,Ka onye nēbili imegidem di kwa ka onye ajọ omume.
8. N'ihi na gini bu olile-anya onye emeruru emeru, mb͕e Chineke nēbipu ya,Mb͕e Chineke nēsepu nkpuru-obi-ya?
9. Chineke, Ọ̀ gānu iti-nkpu-ya,Mb͕e nkpab͕u nābiakwasi ya?
10. Ìhe nke Onye puru ime ihe nile gātọ ya utọ?Ọ̀ gākpọku Chineke na mb͕e nile?
11. M'gēzí unu ihe site n'aka Chineke;M'gaghi-ezobe ihe nke di n'aka Onye puru ime ihe nile.
12. Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya;N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?
13. Nka bu òkè madu nēmebi iwu n'ebe Chineke nọ,Na ihe-nketa nke ndi nēme ka madu ma jijiji, nke ha nānara n'aka Onye puru ime ihe nile.
14. Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha;Umu nke putara n'aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ.
15. Agēli ndi-ya fọduru n'ọnwu,Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá.
16. Ọ buru na ọ kwakọba ọla-ọcha dika ájá,Dozie uwe dika urọ;