7. Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n'oyi.
8. Oké miri-ozuzo nke ugwu nēde ha,Ma ebe ha nēnweghi ebe-nb͕abà, ha we b͕akua oké nkume.
9. Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n'ara n'ike,Nara kwa onye ewedara n'ala ihe-ibe:
10. Ha we nējeghari b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,N'agu-ha ka ha nēbu kwa ùkwù-ọka;
11. N'etiti mb͕idi-ha ka ha nāpi manu;Ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile ha ka ha nāzọ ukwu, ma akpiri nākpọ ha nku.
12. Ha nēsi n'obodo ndikom sua udè,Nkpuru-obi ndi emeruworo aru nētiku Chineke:Ma Chineke adighi-agu ya n'ihe-nzuzu.
13. Ndi ahu nọ n'etiti ndi nānupu isi n'okpuru ìhè;Ha amataghi uzọ-ya nile,Ha ebighi kwa n'okporo-uzọ-ya nile.
14. Ìhè ututu ka ob͕u-madu ji bilie, o nēb͕u onye ewedara n'ala na ob͕eye;N'abali kwa ọ di ka onye-ori.
15. Ọzọ, anya onye nākwa iko nāriba chi-ojiji ama,Si, Ọ dighi anya ọ bula gēkirim:Ọ nēzobe iru-ya.