1. Gini mere Onye puru ime ihe nile nējighi tukọba mb͕e?Gini mere ndi mara Ya nējighi hu ubọchi-Ya nile?
2. Ufọdu nēwezuga ókè-ala;Ha anapuwo kwa ìgwè aturu n'ike, we nāzù ha.
3. Ha nākpupu inyinya-ibu nke umu-nb͕ei,Ha nānara kwa ehi nke nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe.
4. Ha nēsi n'uzọ wezuga ndi-ob͕eye:Ndi ewedara n'ala nke uwa ezobekowo onwe-ha n'otù.
5. Le, dika inyinya-ibu-ọhia n'ọzaraKa ha nāpu ije ọlu-ha, nāchọsi nri-ọtita-ha ike;Ala ihe nādighi nēmere ha nri umu-ha gēri.
6. N'ọhia ka ha nile n'otù n'otù nwe nri-ha agwara agwa dika ihe-ubi;Ha nātutukọ kwa nkpuru-vine fọduru n'ubi-vine onye nēmebi iwu.
7. Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n'oyi.
8. Oké miri-ozuzo nke ugwu nēde ha,Ma ebe ha nēnweghi ebe-nb͕abà, ha we b͕akua oké nkume.
9. Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n'ara n'ike,Nara kwa onye ewedara n'ala ihe-ibe:
10. Ha we nējeghari b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,N'agu-ha ka ha nēbu kwa ùkwù-ọka;
11. N'etiti mb͕idi-ha ka ha nāpi manu;Ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile ha ka ha nāzọ ukwu, ma akpiri nākpọ ha nku.
12. Ha nēsi n'obodo ndikom sua udè,Nkpuru-obi ndi emeruworo aru nētiku Chineke:Ma Chineke adighi-agu ya n'ihe-nzuzu.
13. Ndi ahu nọ n'etiti ndi nānupu isi n'okpuru ìhè;Ha amataghi uzọ-ya nile,Ha ebighi kwa n'okporo-uzọ-ya nile.
14. Ìhè ututu ka ob͕u-madu ji bilie, o nēb͕u onye ewedara n'ala na ob͕eye;N'abali kwa ọ di ka onye-ori.
15. Ọzọ, anya onye nākwa iko nāriba chi-ojiji ama,Si, Ọ dighi anya ọ bula gēkirim:Ọ nēzobe iru-ya.
16. O gwupúwo ulo n'ọchichiri:N'ehihie ha nēmechibido onwe-ha uzọ;Ha amaghi ìhè.