13. B͕anu nkiti, pua n'ebe m'nọ, ka m'kwu kwa, mu onwem,Gini gāgabiga kwa n'arum?
14. N'ìhi gini ka m'gēburu anu-arum n'ezém,Tiye kwa ndum n'ọbu-akam?
15. Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere:Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya.
16. Ọzọ, Ya onwe-ya gāburum nzọputa;N'ihi na onye emeruru emeru agaghi-abia n'iru Ya.
17. Nurunu okwum nile nke-ọma,Ka nkwuputam di kwa na nti-unu.
18. Biko, le, edowom ikpém n'usoro;Amawom na mu onwem bu onye ezi omume.
19. Ònye bu onye ahu nke mu na ya gēkpe ikpe?N'ihi na ub͕u a ka m'gāb͕a nkiti, kubìe ume.
20. Nání emelam ihe abua,Mb͕e ahu m'gaghi-ezopu onwem n'iru Gi:
21. Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya;Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku.
22. Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa;Ma-ọbu ka m'kwue, I we zam.
23. Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole?Me ka m'mara njehiem na nmehiem.
24. N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi,Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ?
25. Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji?Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ?