13. O rue na, dika ọ kọrọ isi nrọ nye ayi, otú a ka ọ di; mu ka ọ mere ka m'lata n'ọnọdum, ma ya ka ọ kwugburu.
14. Fero we ziga kpọ Josef, ha we me ka o si n'olùlù ahu b͕aputa: ọ kọpu isi-ya, b͕anwe uwe-nb͕okwasi-ya nile, bakute Fero.
15. Fero we si Josef, Nrọ ka m'rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya: ma mu onwem anuwo okwu bayere gi, si, na i nānu nrọ ikọ isi-ya.
16. Josef we za Fero, si, Ọ dighm n'aka: Chineke gāza aziza udo nye Fero.
17. Fero we gwa Josef okwu, si, Na nrọm, le, m'nēguzo n'usọ osimiri Nail:
18. ma, le, ehi asa nēsi n'osimiri Nail rigoputa, ha mara abuba n'anu-aru-ha, ma kwa nma n'aru; ha we ta nri n'etiti ubi:
19. ma, le, ehi asa ọzọ nārigoputa n'azu ha, ha adighi nma, jọ njọ n'aru nke-uku, ta kwa aru n'anu-aru-ha, ahughm otú ndi ahu n'ijọ-njọ n'ala Ijipt nile:
20. ehi ahu ndi tara aru, ndi, jọkwara njọ, we rie ehi asa mbu mara abuba:
21. ma mb͕e ha basiri n'afọ-ha, amaghi na ha barari n'afọ-ha; ma ha jọrọ njọ ile anya, dika na nmalite. M'we teta.
22. M'we hu na nrọm, ma, le, oko ọka asa nāwaputa n'otù ókpòrò, ha soro nkpuru, di kwa nma:
23. ma, le, oko ọka asa, nke kpọnwuru akpọnwu, nke fikpọ-kwa-ra afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọ-kwa-ra, nēpuso ha n'azu:
24. oko ọka asa ahu nke fikpọrọ afikpọ we loda okọ ọka asa ahu di nma: m'we gwa ndi-ode-akwukwọ di nsọ; ma ọ dighi onye nēgosim ya.
25. Josef we si Fero, Nrọ, Fero, otù ka ọ bu: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka O gosiworo Fero.
26. Ezi ehi asa ahu, arọ asa ka ha bu; ezi oko ọka asa ahu, arọ asa ka ha bu kwa: nrọ ahu, otù ka ọ bu.
27. Ehi asa ahu nke tara aru, nke jọ-kwa-ra njọ, nke nārigoputa n'azu ha, arọ̄ asa ka ha bu, ha na oko ọka asa ahu nke di efù, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọrọ; ha gābu arọ asa nke oké unwu.
28. Nke ahu bu okwu nke m'gwara Fero: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka Ọ mere ka Fero hu anya.