5. Ọ si ha, Unu mara Leban nwa Nehoa? Ha si, Ayi mara ya.
6. Ọ si ha, Ọ̀ nọ n'udo? Ha si, Ọ nọ n'udo: ma, le, Rechel, bú nwa-ya nwayi, nābia, ya na ìgwè ewu na aturu-ya.
7. Ọ si, Le, ubọchi fọduru ri nne, nka abughi mb͕e anāchikọta anu-ulo: menu ka ìgwè ewu na aturu-unu ṅua miri, jenu zùa ha.
8. Ha si, Ayi apughi, rue mb͕e agāchikọta ìgwè aturu nile, ha we kpọrepu nkume n'elu ọnu olùlù miri a: ayi we me ka ìgwè ewu na aturu nua.
9. Mb͕e ọ nọ nākpayere ha uka, Rechel biara ya na ìgwè ewu na aturu nke nna-ya nwere; n'ihi na onye-ọzùzù-aturu ka ọ bu.
10. O rue, mb͕e Jekob huru Rechel, bú nwa-nwayi Leban nwa-nne-ya, na ìgwè ewu na aturu Leban, bú nwanne nne-ya, na Jekob jeruru nso, kpọrepu nkume ahu n'elu ọnu olùlù-miri ahu, me ka ìgwè ewu na aturu Leban, bú nwanne nne-ya, ṅua.
11. Jekob we sutu Rechel ọnu, welie olu-ya, kwa ákwá.
12. Jekob we gosi Rechel na nwa-nne nna-ya ka ọ bu, na nwa Rebeka ka ọ bu kwa: ọ we b͕a ọsọ, gosi nna-ya.
13. O rue, mb͕e Leban nuru akukọ Jekob, bú nwa nwa-nne-ya, na ọ b͕ara ọsọ izute ya, ọ b͕akua ya, sutu ya ọnu nke-uku, me ka ọ ba n'ulo-ya. Ọ we kọrọ Leban ihe nile ndia.
14. Leban we si ya, N'ezie ọkpukpum na anu-arum ka i bu. Ya na ya we nọ ogologo otù ọnwa.
15. Leban we si Jekob, Ọ̀ bu n'ihi na nwa-nnem ka i bu na i gēfèm n'efu? gosim, gini gābu ugwọ-ọlu-gi?
16. Ma Leban nwere umu-ndinyom abua: aha nke-okenye bu Lia, aha nke-ntà bu Rechel.
17. Anya Lia esighi ike; ma Rechel mara nma n'aru ma kwa nma ile anya.
18. Jekob we hu Rechel n'anya; ọ si, M'gēfè gi arọ asa n'ihi Rechel, bú nwa-gi nwayi nke-ntà.
19. Leban we si, Ọ di nma ka m'nye gi ya, kari were ya nye nwoke ọzọ: nọyerem.
20. Jekob we fè òfùfè n'ihi Rechel arọ asa; ha di n'anya-ya dika ubọchi ole-na-ole, n'ihi ihu-n'anya o ji hu ya.
21. Jekob we si Leban, Nyem nwunyem, n'ihi na ubọchim nile ezuwo, ka m'we bakuru ya.
22. Leban we chikọta ndi ebe ahu nile, me oké oriri.
23. O rue, n'anyasi, na o kuru Lia nwa-ya, me ka ọ bakuru Jekob; Jekob we bakuru ya.
24. Leban we nye ya Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, ka ọ buru nwayi nējere Lia nwa-ya nwayi ozi.
25. O rue na, n'ututu Jekob wee hu na nwanyi ahu bu Lia: ọ we si Leban, Gini bu nka i meworom? Ọ̀ bughi n'ihi Rechel ka m'efère òfùfè n'aka gi? n'ihi gini kwa ka i ghọb͕urum?